Take a fresh look at your lifestyle.

Tinubu na-achọ ka ụlọikpe nye ya ohere inyocha ihe ndị e ji mee ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023

0 374

Onye a họpụtara ịchị Naịjirịa bụ BolaTinubu amalitela ịchọ ka Ụlọikpe Mkpegharị nye iwu ha ọ nweta ikike ịhụ ngwaọrụ ndị Independent National Electoral Commission (Inec) ji mee ntuliaka nke abali iri abuo na ise n’ọnwa Febrụwarị, 2023.

Onye ọkaiwu ya bụ Akintola Makinde, kwuru na ọ ga-adị mkpa ka ọ nyochaa, ma nweeike sete foto ụfọdụ n’ime ihe ndị e ji mee ntuliaka ahụ ihe kwadobe onwe ya maka ikpe ụfọdụ na-adapụta bụ ndị chọrọ ka akagbuo mmeri Tinubu na ntuliaka ahụ.

Makinde kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde.

Cheta na Inec kụchapụrụ ụfọdụ mkpesa ndị pati PDP na LP mere n’ụlọikpe pụrụiche nke Presidential Election Petition Court. Mkpesa ndị a gụnyere inye ha ohere ha ha nyocha ngwa ọrụ Bvas nke Inec nakwa arịọrịọ ka edobe ụfọdụ ngwaọrụ ndị ọzọ ma ghara ịkpa ya aka mana onye ọkaiwu Inec bụ , Tanimu Inuwa kwuru ka akụchapụ arịọrịọ ndị a dịka ọ kọwara na ime nke a ga-emetụta ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa na Satọdee.

Ọ gbakwụnyere na e nwere ọdọ ntuliaka ruru 176,000 e mere ntuliaka na Naịjirịa ma kwuo na ha niile nwere igwe BVAS nke ha pụrụiche nke bụ na ịtọkọta ma malite ihazi ha maka mkpesa ga-esiri ha ike ịhazi n’ime obere oge a.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *