Take a fresh look at your lifestyle.

‘Aga m eso ndị ọkaiwu anyị gaa ụlọikpe taa’ – Peter Obi

0 420

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’otu ‘Labour Party’ bụ Peter Obi ekwuola na ya ga-eso ndị ọkaiwu ya gaa ụlọikpe taa gbasara mkpesa ha na-eme maka nrụrụaka ha sị mere na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’abali iri abụọ na ise nke onwa Febrụwarị.

Peter Obi kwuru nke a site n’akara Twitter ya dịka ọ kọwara ihe mere na ọ gaghị enweike ịga steeti dị icheiche ma kwadoo ndị otu Labour Party na-azọ ọkwa Gọvanọ na steeti ndị ahụ.

“Taa ka m kwesịrị ịmalite njem nkwado maka ndị ‘Labour Party’ na-azọ ọkwa Gọvanọ na oche omeiwu na steeti dị icheiche. Njem a kwesịrị ibuga m Nasarawa, Legọs, Enugu, Abia, Delta, Edo, Rivers, Plateau, na Borno Steeti,” Obi kwuru.

“Mana dịka Inec jụrụ ikwe ka anyị nyochaa akụrụngwa ndị e ji mee ntuliaka onyeisiala n’ụbọchị 25 nke Febrụwarị (nke gụnyere BVAS), aga m eso ndị ọkaiwu anyị gaa ụlọikpe taa.”

Obi gwara ndị nkwado ya na steeti dị icheiche ka ha nyekwa ndị niile na-azọ ọkwa na Labour Party ụdị nkwado ha nyere ya na steeti dị icheiche.

“Dịka m na-agba mbọ iweghachite mmeri anyị, ọ dị mkpa ka ndị ụnụ tụọrọ onye ọbụla ma ọrụ, nwee ezi agwa, dị ike ọrụ ma nwee obi ọmaiko vootu,” Obi kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *