Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii ekwuola na a ga-ekpe onye otu ha gburu onye a na-enyo enyo ikpe maka igbu ọchụ

0

Ndị uweojii ekwuola na a ga-ekpe onye uweojii ahụ gbagburu onye a na-enyo enyo n’Effurun Delta Steeti ikpe maka igbu ọchụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti bụ Bright Edafe, kwupụtara nke a n’oge ụlọmgbasaozi Channels Tv na-agba ya ajụjụ ọnụ na Wenezde 29 Eprel, 2026, kwuru na ha nwụchiri onye uweojii ahụ gbagburu otu onye a na-enyo enyo na steeti ahụ.

Edafe kwuru na a kpọgara onye uweojii ahụ, aha ya bụ ASP Nuhu Usman, n’isi ụlọọrụ ndịagha dị n’Abuja ka e nye ya ntaramahụhụ ruuru ya.

N’ozi Edafe wepụtara n’akara X ya, Nuhu Usman gbagburu Mene Ogidi gbara afọ 28 n’ụzọ usoro ọrụ ha megidere.

Bright Edafe kwuru na omume Usman bụ nke a na-amaghị ka a ga-esi kọwaa ya, e wezuga maọbụ ihe sitere na mmụọ, ma kwuokwaa na ọdachi ahụ mere oge Mene gara izigara mmadụ ibu n’ọdọụgbọala.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere e jiri kpuchie ihu Usman na foto ya ndị uweojii wepụtara, Edafe kwuru na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *