Take a fresh look at your lifestyle.

Onye bụ Cole Tomas Allen chọrọ ịgbagbu Donald Trump?

0

A ga-akpọga onye a na-enyo enyo na ọ gbara egbe n’ebe ndị ntaakụkọ White House na Onyeisiala na-erikọ nri abalị na Washington DC n’abalị Satọde n’ụlọikpe taa.

Ndị mgbasaozi mba Amerịka akọwaala ihe dị mkpa mmadụ kwesiri ịma banyere onye a na-enyo enyo gbara egbe oge Onyeisiala Trump na ndị nataakụkọ na-enwe ọgbakọ ahụ.

Lee ihe ịkwesiri ịma maka ya ebe a:

1. Aha onye a a na-enyo enyo bụ Cole Tomas Allen.

2. Ọ dị afọ iri atọ na otu. O si obodo Torransi na Kalifonịa dị na mba Amerịka.

3. Onyeisi ngalaba ikpe na mba Amerịka bụ Todd Blanche kwuru na nchọpụta “nke izizi” ha mere na-egosi na onye a a na-enyo enyo kwuru na ọ bụ ndị so n’ọchịchị Trump ka ọ chọrọ ịwakpo.

4. N’ihe na-erughị otu elekere nke ihe ahụ mere, n’ọba ozi ya n’akara soshịal midịa ya bụ Truth Social, ka Onyeisiala Trump kwupụtara na “e jidela onye ahụ gbara egbe ahụ”, ma mesịa tinyekwa foto ya.

5. Ndị mmanye iwu gwara ndị ntaakụkọ BBC n’Amerịka na CBS News ụnyahụ na e ji onye a na-enyo enyo n’ụlọọrụ ndị uweojii Metropolitan dị na north-west Washington DC, na a ga-akpụga ya ụlọikpe na ụlọnga dị na ndịda-ọwụwa anyanwụ nke isi obodo ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *