Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Ga-eme Ka Mmekọrịta Ya Na Iran Sikwuo Ike

Timothy Choji dere ya na Bekee

0 475

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela osote Onyeisiala mba Iran nkwa njikere Naijiria dị ịkwalite mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ.

Onyeisiala Buhari kwuru nke a oge osote Onyeisiala mba Iran bụ Mohsen Mansouri gara leta ya n’oge ọgbakọ United Nations na-eme na Doha, isi obodo steeti Qatar.

Dịka Onyeisiala siri kwuo, “Mụ na ndị Iran esorola m kpakọrịta kemgbe ọtụtụ afọ ọkachasị mgbe m bụ minista mmanụ ụgbọ ala wee ghọta obodo ahụ na ndị ya.

“Ya mere, a nam anabata nkwado mmekọrịta dị n’etiti mba anyị, ebe anyị nwere ihe mgbakwunye, karịsịa na mmepụta ike.”

Onyeisiala gwakwara onye ọbịa ya gbasara ntuliaka e mere na Naịjirịa nso nso a na onyeisiala ọhụrụ ga-eweghara ọchịchị n’ihe na-erughị ọnwa atọ na-atụ anya na mmekọrịta siri ike o wulitere n’etiti mba abụọ ahụ ga-aga n’ihu na-adịgide adịgide na ọchịchị ọhụrụ ahụ.

Onye osote Onyeisiala Iran kwuru na obi dị ya ụtọ na ya na onye ndu Naijiria zutere, ghọta nke ọma na mba abụọ ahụ nwere akụ na ụba ọnatara chi na akụ na ụba si na mmadụ, ha nwere mkpa ijikọ ọnụ na mpaghara ndị ọzọ dịka ọrụ ugbo.

Ebe Iran nwere mmachi mba ụwa ugbu a maka ihe gbasara nuclear na ihe ndị ọzọ, Mazị Mansouri kwusiri ike na dịka ndị isi na mpaghara ha, ọ dị mkpa ka mba abụọ ahụ gbaa mbọ inwe ọtụtụ ezi mmekọrita, gbakwụnye na ụzọ ịga n’ihu bụ ịtọlite ​​​​ma wusie kọmishọn njikọ dị n’etiti mba abụọ ahụ n’ọkwa kachasị elu.

Leave A Reply

Your email address will not be published.