Take a fresh look at your lifestyle.

Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye pati ‘APC’ na ‘Ward’ ya

0 201

Akwụsịtụla onyeisioche ‘All Progressives Congress’ (APC) bụ Abdullahi Ganduje ị bụ onye pati ahụ na wọọdụ ya dị n’okpuruọchịchị Dawakin Tofa na Kano Steeti.

Ndị isi ọchịchị wọọdụ Ganduje nke onyeisioche ya bụ Haruna Gwanjo kpuhere nke a n’oge ọ na-agwa ndị ọrụ mgbasaozi okwu na Kano n’ụbọchị Mọnde 15 Eprel 2024.

Gwanjo sịrị na Ganduje, onye bụụrụ aka na-achị Kano Steeti kwesịrị ịgọpụ onwe ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya banyere akwụkwọ ego Dọla.

Cheta na ụlọikpe ukwu dị na Kano nọọrọ n’abalị 9 Eprel 2024 tinye abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.

Leave A Reply

Your email address will not be published.