Take a fresh look at your lifestyle.

Lee etu e si akwado maka oliliozu Junior Pope

0 710

Otu jikọtara ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) ahọpụtala ndị nnọchiteanya 30 site na steeti ise maka oliliozu Junior Pope.

Onyeisioche AGN bụ Emeka Rollas kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’akara ọbaozi Instagram ya banyere nkwado a na-eme maka oliliozu onye otu ha ahụ nwụrụ anwụ.

Dịka Emeka Rollas siri kwuo, steeti ise ndị ahụ gụnyere Delta, Imo, Abịa, Anambra na Enugwu.

O kwuru na agaghị enye onye ọbụla ohere ise foto maọbụ onyonyoo aghara aghara ebe ndị ọrụ mgbasaozi ga-ebu ụzọ nata ikike n’aka ezinaụlọ ya tupu enye ha ohere.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.