Take a fresh look at your lifestyle.

E liela ozu Abigail Frederick so Junior Pope nwụọ n’ihe mberede ụgbọmmiri na steeti ya

0 649

E liela ozu nwada Abigail Frederick bụ onye na-achọ ndị Nollywood mma a kpọro ‘makeup artist’ so nwụọ n’ihe mberede ụgbọmmiri ahụ gburu Junior Pope na mmadụ anọ n’osimmiri Naịja.

E liri ozu nwada a n’obodo ya bụ Ikot Udoma, nke okpuruọchịchị Eket dị n’Akwa Ibom.

Ọ bụ ndị ụlọụka Church of Christ haziri ofufe olili ya bụ nke ọtụtụ ndị ọrụ gọomentị Akwa Ibom Steeti bịara.

Cheta na e liburu ya n’akụkụ mmiri maka na ezinaụlọ ya enweghi ego ha ji emekọ mmụọ mmiri, mana gọọmentị Akwa Ibom nyere iwu ka a bọpụta ozu ya ma buru ya bịa lie na steeti ha.

Leave A Reply

Your email address will not be published.