Take a fresh look at your lifestyle.

Peter Obi akọwaala ihe mere ya n’ọdọụgbọelu mba Briten n’oge gara aga

0 476

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 n’otu Labour Party, bụ Peter Obi, akọwaala ihe mere oge ọ gara njem na mba Briten n’ọdị nso a dịka akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa jichiri ya nwa.

Akụkọ ahụ wuru ewu ihe dịka izuụka abụọ gara aga ma kwuo na ndị ọrụ nchekwa mba Briten jichiri Peter Obi maka na o ji akwụkwọ adigboroja banye na mba ahụ, ebe ụfọdụ sị na ihe e ji jichie ya bụ maka na e nwere onye ọzọ ji aha ya banye na mba ahụ.

Na mkparịtaụka nke ya na ụlọ ntaakụkọ Arise TV nwere n’ụbọchị Mọnde, Obi kwuru na akụkọ ahụ niile na-efegharị enweghị nke bụ eziokwu.

Nke a bụ nke mbụ Peter Obi na-ekwu okwu banyere akụkọ kpọmkwem ihe mere ya na London. O kwuru na oneghị ihe ọbụla merenụ karịa nnyocha nke ndị ọrụ nchekwa na-enyocha onye ọbụla tupu ọ banye na UK.

“Ihe niile ahụ erughị nkeji 20 tupu m gawakwa ebe m na-aga n’ụbọchị ahụ,” Peter Obi kọwara.

“Ihe merenụ bụ na ndị ọrụ ‘immigration’ lere akwụkwọ m anya ma sị na ha chọpụtara ihe na-edochaghị ha anya nke mere o ji kwesị ekwesị ka ha lekwuo ya anya.”

“Onye ọrụ nchekwa ahụ ji olu nwayọ na nkwanye ugwu wee kọwaara m na ọ dịka onwere onye ji aha m nọrọ na mba UK, ma gwakwa m ka uche m dị n’ihe na-emenụ.”

Gbasara ebubo nke otu onye a ma ama na mpaghara Niger Delta bụ Asari Dokubo boro ma kwuo na ya nwere ihe akaebe na-egosi na Peter Obi bụ nwaafọ na mba Solomon Island bụkwa ebe o nwere ụlọ, Obi kwuru na ebubo ahụ bụ asị.

“Amaghị m ebe Solomon Island dị. Agabeghị m mba ahụ mbụ. Enweghị m ụlọ ọbụla n’ebe ọbụla karịa na Naịjirịa nakwa na London bụ ebe m biri ọtụtụ afọ. Mba ọbụla a hụrụ ụlọ ọbụla n’aha Peter Obi, ọ bụghị eziokwu,” ka ọ kọwara.

Obi tinyekwara ọnụ n’ebubo nke Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed boro ya na osote ya bụ Datti Baba-Ahmed na ha na-achọ ịkụsa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa nke bekee na-akpọ ‘treason’.

O kwuru na ọ bụ ihe mwute na gọmentị Naịjirịa na-emefu ego n’ihe enweghị isi nke kpatara Lai Mohammed ji mefuo ego gawa mba Amerịka nakwa UK bụ ebe ọ nọrọ bo ya ebubo ‘treason’.

Obi kwukwara na foto na-efegharị na soshal midia nke na-ekwu na ya gara leta onyeisiala a họpụtara ọhụrụ bụ Bola Tinubu nke APC bụ foto adigboroja.

“Onweghị mgbe m gara hụ Tinubu, ihe ndị a bụcha akụkọ ụgha a na-ekesa iji ghọgbuo ndị nkwado m,” ka o kwuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *