Ihe ị nwere ike ime ka obi dị gị mma
1.) Ihe mbụ ị ga-eme bụ chọọ ndị dịka gị na-alụbeghị dí maọbụ nwaanyị, mee ha enyi. Ọ ga enye gị aka ịnabata onwe gị.
Meghe obi gị ịnabata onwe gị etu ọbụla ka ị dị, ka ị ghara ichegbu onwe gị.
E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?
2.) Nwee akaraka nke gị. Echela ka di gị maọbụ nwunye gị bịa tupu ị chọta akaraka gị.
3.) Gbado anya n’uru ị barala ezinụlọ gị, ndị ọrụ gị maọbụ na ndị agbataobi gị.
4.) Leta onwe gị ọfụma. Ka i si elekọta ụmụ nne gị, letakwa onwe gị, site n’ịsapụ ahụ gị ma jikere onwe gị site n’igote akwa ga-ama mma n’ahụ gị.
Dozie ebe i bi ọfụma, kpo hapụ idoko atịtị ma lekọtakwa ahụ ike gị ka obi dị gị mma.
5.) Pụọ n’ụlọ, gaa mmemme, mmekọrịtara mmadụ ibe gị, mee enyi ma bụrụkwa ezigbote enyi. Agbala ndị mmadụ ọsọ, mere enyi. Ekekpọla ihu gị mgbe niile.
BBC
Leave a Reply