Take a fresh look at your lifestyle.

Ubochi ndi oru-Ihe ndị ọrụ oyibo n’Enugu na-achọ n’aka gọọmentị

0 499

Otu abụọ jikọrọ ndị ọrụ oyibo ọnụ na Naijiria bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) ngalaba nke Enugwu ekwuola na ọbụghị ndị ọrụ niile na-enweta ya bụ ego opekatampe ụgwọ ọnwa bụ puku naịra iri atọ nke a na-akpọ ‘minimum wage’ na Bekee.

Ha gbakọrọ n’ụbọchị Tuzde n’ama Okpara Square dị n’Enugwu dịka a na-eme mmemme ụbọchị ndị ọrụ ma kọwa ihe ndị na-akpa ha.

Onyeisi NLC n’Enugwu bụ Maazị Fabian Nwaigbo na ogbo ya nke TUC bụ Maazị Ben Asogwa gwara ndi ntaakuko Igbo n’ama emume a na obi adịghị ha mma na ụfọdụ ndị nkuzi na ndị ọrụ okpuru ọchịchị anaghị eri ego opekatampe ahụ gọọmentị nyere iwu ya.

Ha rịọrọ gọọmentị Enugwu ka ọ hazie ya bụ ihe kpam kpam tupu ndị ọhụrụ abata n’ọchịchị.

Ọtụtụ ndị ọrụ oyibo gbakọrọ n’Okpara Square ma rịọ gọmenti etiti ka o welie aka n’ego ndị ọrụ iji mee ka ụgwọ ọnwa ndị ọrụ zuoro ha igbo mkpa.

Onye nchịkọta otu ndị ntaakụkọ nke NUJ Enugwu bụ Sam Udekwe rịọrọ ka ndị ntaakụkọ na-agbasa eziokwu ma gbaara akụkọ ụgha.

Ya bụ mmemme ụbọchị ndị ọrụ e kwesịburu ime n’ụbọchị Mọnde bịara bụrụ n’ụbọchị Tuzde na steeti ahụ maka nchekwa ndụ na akụnụba ndị Enugwu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *