Take a fresh look at your lifestyle.

Etu esi eme ‘millet bread’ na-adịghị oke ọnụ

0 295

Nsogbu obibi ndu: Etu m ji wee chọpụta ka e si eji millet eme achịcha Bekee

Kemgbe agha Yukren na Rọshịa bidoro na onwa Febụwarị afo 2022, ọnụ ego ntụ flour eji emepụta achịcha dị icheiche ariela ọnụ nke ukwuu mere ka ọnụ ego achịcha na-adị ọnụ.

Nke mere na Naịjirịa bụ na ebuliela ego achịcha site na nari naira abuo ruo nari naira isii, na-aga ebe out puku naira n’ime otu afọ.

Juliet Aigbe, osiite na-emepụta achịcha dị icheiche chopụtara etu e si eji ntụ millet emepụta achịcha ndị a.

Etu m ji wee chọpụta ka e si eji millet emeputa bread na-adịghị oke ọnụ

Nwaada a sị na ebumnuche ya bụ ibelata ọnụ ego o ji azụ ntụ wiiti e ji emepụta achịcha.

Mana ọ kwụsịghị ebe a, ọ kpọkọtara ọgbakọ ndị osiite, ma gosikwa ha ka o si eji ntụ millet emepụta ya bụ achịcha ndị a n’ụzọ iribama.

Ọ na-ekwu na ọ bụghị na a ga-akwụsị iji ntụ ya bụ ntụ wiiti eme ya bụ achịcha kpamkpam, mana ọ bụ iji belata ego nrụpụta ya.

Ọ sị na iji ntụ millet a mepụta bụreedị nwekwara uru ọ barala ahụike maka ihe millet na-enye anụ ahụ mmadụ.

Ọ na-asị na e bido nrụpụta achịcha ntụ millet n’igwe, ọ ga-enye aka ibelata ọnụ ego ya ebe ụwa niile na-achọ ka e si ebelata ego ya.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.