Omenala bu odi bee ndi,iti na ịgba egwu ọdịnala bụ otu n’ime omenala e ji maara ndị Igbo niile, nke ha ji egosi etu obi dị ha kwa mgbe.
O nweghi emume ọbụla ndị Igbo na-eme ka egwu ghara ịdị na ya.
Etu nnu na-atọ na nri bụ ka egwu dị n’emume ọbụla ndị Igbo na-eme, ọ na-eme ka emume dị ụtọ.
E nwere ọtụtụ egwu ọdịnala bụ nke si na mpaghara dị iche iche mejupụtara ala Igbo.
Egwu ndị a nwere ụzọ pụrụiche e ji agba ha; ndị e ji ukwu, ụkwụ, aka, obi na akụkụ ahụ ndị ọzọ agba.
Akụkọ a ga-eleba anya n’ụfọdụ egwu ndị ahụ nakwa mpaghara Igbo ha si.
Ikperikpe ọgụ.
Ikperikpe ọgụ bụ otu n’ime egwu ndị e ji mara ndị Igbo nke a na-akpọ egwu agha (iri agha).
Ọ bụ naanị ụmụnwoke, ọkachasị ndị agha na-agba ya, ma ha gaa agha merie.
A na-eji ụkwụ na obi agba ya bụ egw, onye na-enweghi akpụ obi agaghị agbata ya nke ọma.
Onye na-agba egwu a n’Ohafia, Abia Steetị gwaa ndi ntaakuko Igbo na tupu nwoke etozuo oke isonye ha na ọ ga-egbute isi mmadụ maọbụ gbaa nnụnụ.
Ọ sị na mgbe mbụ na a na-egbu isi mmadụ kama ugbua na bụzi ịgba nnụnụ.
Nwoke ahụ gaa n’ọhịa gbata nnụnụ, o were nye nna ya ka ọ gọọ ọfọ, nyekwa nne ya ka o sie ma kee ndị okoroọbịa ibe ya.
Obodo ndị e ji egwu a maara bụ ndị si mpaghara Abia North dịka Ohafia, Abiriba, Arochukwu dgz.
Nkwa ụmụagbọghọ
Nke a bụ egwu ụmụagbọghọ na-alụbeghi di na-agbakaarị.
O nwere obodo dị iche iche nwere aha ha na-akpọ ụdịrị egwu.
Obodo ndị dị n’Ebonyi steetị dịka Afikpo, Abakaliki bụ ebe ọ kachasị gbapụta ihe na-akpọ ya ‘Ngwa ụmụagbọghọ.
Akụkọ kwuru na ọ bụ egwu a ka Uche, bụ nwunye Nnamdi Azikikwe gbara mgbe mbụ o zutere Azikiwe.
Mgbe ahụ Uche Azikiwe bụ onye ndu ndị otu egwu ahụ n’Afikpo.
Atịlọgwụ
Atịlọgwụ so otu n’ime egwu e jiri mara ndị Igbo
Otu nwoke na-agba egwu a bụ Akadieze Ambrose gwara BBC Igbo sị na ọ bụ ndị obodo udi na Ezeagu nke Enugwu Steeti malitere ịgba egwu Atịlọgwụ.
Akụkọ kọrọ na obodo abụọ ndị a mụrụ ya bụ egwu n’ebe dị icheiche nke gụnyere Awka, n’Anambara steeti n’afọ 1942.
Ihe egwu a pụtara bụ ‘e tinyere ya ọgwụ?’ maka etu e si eji ahụ niile ma ụkwụ, aka, isi, agba ya.
Atilogwu so n’egwu tuuru ugo n’emume ‘Festical of Arts and Culture’ (Festac), e mere na Naịjirịa n’afọ 1977.
Ambrose sị na a gwara ya bụ egwụ ọgwa tinye ya egwu ọdịnaala ndị ọzọ dịka Ogwurogwu, Ugwuọyakanga, Ọganigwe, na Odegere bụ nke mere ka ọ bụrụ ọpụrụiche dị n’egwu.
Ọ bụ naanị ụmụnwoke na-agba ya bụ egwu maka etu ha si efeli elu ma tụgharịa ahụ n’ịgba egwu a.
Egwu Egedege
Nke a so n’egwu ọdịnala Igbo kachasị gbapụta ihe, nke malitere kamgbe gboo dịka egwu ndị ọzọ.
Ọ bụ egwu ọnwa e ji mara ndị nnanna na nnenne ochie nke obodo Unubi dị n’Anambra Steetị.
Mmalite egwu a na-abụ opi na ọja, ka ndị otu egwu a ga-eji anabata Ezenwaanyị ha bụ onye na-agụ ma na-agba ya.
Ndị ọzọ so n’otu egwu ahụ ga na-ekwe ukwe ma na-agba egwu a.
Agaghị akọ akụkọ egwu Egedege ghara ịkpọta aha nwada Theresa Onuorah nke Unubi, bụ onye mere ka ọ bụrụ egwu na-ewu ewu.
Egwu Ogene
Ogene bụ egwu a ma ama nke a na-eji ezi ikike dị mmadụ n’ahụ agba, onye erighi nri agaghị agbanwu ya.
A kpọrọ ya ‘egwu ogene’ maka na ogene bụ isisekpu ntị na ya bụ egwu.
Nke ahụ apụtaghị na ọ bụ naanị ogene ka e ji eti ya, ngwa egwu ndị ọzọ e ji na-etinye nnu na ose n’egwu a gụnyere, ogene, ọja, ọyọ, ịchaka, udu, ekwe dgz.
A na-ehudata ala, were mkpịsị ụkwụ sọnye n’ala dịka a na-agba egwu a.
Obodo ndị nọ n’Anambra nakwa Enugwu bụ ndị na-agbakaarị egwu a.
Abigbo Mbaise
Dịka aha ha si dị ọ bụ egwu e jiri ndị obodo Mbaise dị n’Imo Steeti bụ nke malitere kamgbe agbụrụ ha bidoro.
Otu onyeisi egwu a bụ Chukwudi Amaefule gwara BBC Igbo na ọ bụ egwu e ji emebọ ihe mere arụ n’obobo.
Na ọ bụrụ mmadụ mee arụ, na ndị Abigbo ga-apụta gụọrọ onye ahụ egwu ikpe ma kpọpụta aha ya ka ọha mere.
Ọ bụ naanị ụmụnwoke aka ha dị ọcha, na-anaghị ezu ohi, egbu mmadụ, agwọ ọgwụ nwereike isonye n’Abigbo.
Ndị otu egwu a na-ama akwa jọọjị n’ukwu, yiri uwe ọcha n’elu ma were ukwu na-agba ya bụ egwu.
Ha na-enwe onye ọbụ abụ na ndị ukwe abụ.
E nwekwara ọtụtụ egwu ọdịnala ndị ọzọ Igbo nwere gụnyere; egwu ekpiri, egwu ụbọ, ịgba ndị Eze, egwu mmụọ, ọmụrụ ọnwa dgz.
Leave a Reply