Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

Ipob Sit at home: etu osi metuta mpaghara owuwanynwu

0 102

Ụzọ dị iche iche tọgbọ chakoo n’isiobodo steeti a, dịka ọtụtụ ndị mmadụ apụtabeghi ịgara mkpa ha.

N’agbanyeghi na ọ bụ ụtụtụ Mọnde, ụfọdụ ebe ndị na-ekwokarị ekwo tọgbọ chakoo.

Ọtụtụ ụgbọala anaghị aga n’okporoụzọ New Haven dị n’Enugwu n’ụtụtụ Mọnde.

Ụzọ Chime Avenue dịkwa na New Haven tọgbọ chakoo ebe elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

Ebe Ụzọ Agric Bank tọgbọ chakoo

N’Abịa,

N’agbanyeghi na ndị ụfọdụ ụgbọala na-agba n’ụzọ n’ụtụtụ a n’Ụmụahịa, isiobodo Abịa steeti, ụfọdụ ndị ekwebeghi apụta ezi.

Ụfodụ ndị ekweghi agbape ọnụụlọahịa ha, ebe ndị nke mepere emepe ji otu ụkwụ kwụrụ.

N’aka nke ọzọ, ụlọakụ, ọdọmmanụ ụgbọala nakwa ụlọakwụkwọ mepere emepe.Ụfọdụ ọdọụgbọala dị n’ebe Isi Gate dị n’Ụmụahịa emepebeghi n’ụtụtụ Mọnde a.

Ụfọdụ ndị agbapebeghi ụlọahịa ha n’Ụmụahịa ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde a.

Ụfọdụ ndị na-agara mkpa ha n’ụzọ Ụzụakọlị dị n’Ụmụahịa, ebe ụfọdụ ndị emepebeghi ụlọahịa ha.

N’Imo,

Ndị mmadụ na-agagharị mkpa ha n’isiobodo steeti ahụ n’ụtụtụ Mọnde a.

Ụzọ Wetheral dị n’Owere adịghị ekwo ekwo,n’ụtụtụ Mọnde a,Abali iri na asaa nke onwa Jenụwarị.

N’Anambra

‘Sit at home’ ọ dị ka ọ dịghị?

Otu Ipob kwuru n’abali iri na ise nke ọnwa Jenụwarị a na ha etinyeghi mmachi onye ọbụla nọrọ n’ụlọ nke ha kpọrọ ‘sit at home’ na Bekee, n’abali iri na itolu na iri abuo nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022, dịka ndị mmadụ na-eche.

N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ziputere, o kwuru na ọ bụ naanị n’ụbọchị 18 Jenụwarị, ụbọchị ikpe onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu n’Abuja, ka onye ọbụla ga-anọ ya bụ ụlọ.

Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na 19 nke ọnwa Jenụwarị a bụ ụbọchị ikpe ha na gọọmentị etiti nke a gbara akwụkwọ ya n’Ụmụahịa, Abịa steeti, mana e nweghi nọrọ n’ụlọ ụbọchị ahụ.

Gịnị butere ‘sit at home’?

Ndị otu Ipob malitere ịnọ n’ụlọ ha kpọrọ ‘sit at home’ kamgbe gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Kanu bụ onyendu ha, n’afọ 2021.

Ha tinyere ya bụ ịnọ n’ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria iji gosi nkwado ha maka ikpe Kanu.

N’afọ 2021, ha tinyere ya bụ ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla, mana ha mechara na-eme ya mgbe ọbụla Kanu kwesịrị ịpụta n’ụlọikpe.

Leave A Reply

Your email address will not be published.