Take a fresh look at your lifestyle.

APC adọọla ọhaneze aka na ntị maka wayo

0 293

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) enyela ọha mmadụ ozi ịdọ aka ná ntị banyere ozi ojoro na-ekesa, na-ekwu na ha na-enye ego di puku naira iri asato na ise”N85,000 empowerment” site n’aka President Bola Tinubu.

Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi nke out ndorondoro a bu, Felix Morka na nkwupụta kwuru na ozi a na-arịọ nkọwa ụlọ akụ ma rịọ ndị nwere mmasị ka ha kpọọ 07078309083.

“Nke a bụ ojoro, anyị na-agbakwa ndị ọha na eze ume ka ha leghara ozi ahụ anya ma zere ịkpọ nọmba ekwentị ezigara ma ọ bụ nọmba ọ bụla metụtara ozi ahụ.”

Mazị Morka kwuru. Otu ahụ gwara ndị ọrụ nchekwa dị mkpa ka ha chọpụta ma kpọpụta ndị mere ihe ahụ n’ụlọikpe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *