Take a fresh look at your lifestyle.

Onweghi ihe ọjọọ dị n’iburu Isiụlọọrụ FAAN na CBN gawa Legọs Steeti – Hope Uzodimma

0 160

Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na o nweghi ihe ọjọọ n’atụmatụ Onyeisiala Bola Tinubu ibuga ụfọdụ ngalaba ụlọọrụ ụgbọelu nakwa ụlọakụ etiti si n’Abuja gawa Legọs.

Uzodimma bụkwa onyeoche ndị gọvanọ n’okpuru pat All Progressive Congress (APC) kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels TV nwere n’ụbọchị Sọnde abali iri abuo na asato nke onwa Jenụwarị 2024.

O kwuru na ihe dị mkpa bụ ma ọrụ ngalaba ndị a na-arụ o kwesịrị ka e buga ha na Legọs.

Uzọdimma gara n’ihu kwuo na ọtụtụ ihe banyere ụlọọrụ ụgbọelu na Naịjirịa bụ na Legọs Steeti ka isisekpu ntị ya dị ya mere e buga isi ngalaba ụlọọrụ ụgbọelu na Legọs steeti, o nweghi ihe ọjọọ dị na ya.

N’otu aka ahụ, o kwukwara na isiụlọọrụ ụlọakụ dị iche iche na Naịjirịa bụ na Legọs steeti ka ha nọ, na ọ bụrụ e buga isiụlọọrụ ụlọakụ etiti si n’Abuja gawa Legọs na o nweghi ihe ọjọọ dị na ya.

Ọ gbakwụnyere na onyeisiala Tinubu enweghi atụmatụ ọbụla ibuga isiobodo Naịjirịa si n’Abuja gawa Legọs dịka ọtụtụ ndị mmadụ ji na-akọ.

Cheta na kamgbe ozi ibuga ụfọdụ ngalaba ụlọọrụ ụgbọelu nakwa ụlọakụ etiti si Abuja gawa Legọs pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla atụmatụ a ọkachasị ndị si mpaghara Ugwu nke Naịjirịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *