Take a fresh look at your lifestyle.

Vince McMahon Onyeisi WWE agbaala arụkwaghịm

0 298

Onyeisi otu mgba mbaụwa ‘World Wrestling Entertainment (WWE) bụ VinceMcMahon agbaala arụkwụaghịm,dịka akwụkwọ mgbasaozi si ụlọọrụ TKO, bụ ụlọọrụ nwe WWE si kwuo.

Nke a na-abịa dịka otu onye ruburu ya ọrụ bụ Nwada Grant sị na McMahon na Laurinaitis gbara ya akwụna nye ụmụnwoke ndị ọzọ iji dọta ndị ọkpọka na ịgba mgba.

Ndi ntaakuko enwetalighị Laurinaitis.

“Akwụ m n’ihe m kwuru n’akwụkwọ Grant gbara bụ asị,asị juru ya.”

McMahon kwuru n’ozi o wepụtara ụbọchị Fraide sị, “Ọmụma atụ mmetọ e nyere bụ ihe emere eme.”

“Iji kwanyere WWE, ụlọọrụ TKO na ndị ọrụ ya ka m ji kpebie itinye akwụkwọ arụkwaghịm ozigbo.

Nwada Grant kwuru na ọ bụ dịka ya enweghị ọrụ ma nọrọ na nsogbu na ndị nne na nna ya nwụrụ anwụ enweghị he ha dobere ka o zutere McMahon o kwe ya nkwa inye ya ọrụ na WWE.

N’akwụkwọ ahụ ọ gbara o kwuru na McMahon rere ya ahụ ọkụ ka ya na ya yịwa, kwee ya nkwa ọrụ.

O mechara malite ọrụ n’isi ụlọọrụ WWE dị na Connecticut n’afọ 2019 na 2022.

O kwuru na hụrụ ya na ọnọdụ jewe ejewa adịghị ma, lawa alawa adịghị mma dịka o chere ya n’ihu ịhọrọ n’ime na-edina McMahon maọbụ ụndụ ahụhụ.”

N’akwụkwọ ikpe ahụ, Grant bokwara ebubo na McMahon “na-enye ya iwu imekọ n’isi ụlọọrụ WWE , ụfọdụ n’oge ọrụ.”

Grant bokwara McMahon na Laurinaitis ebubo ịkpa ya aka n’ebe ekwesịghị n’isiụlọọrụ WWE dị na Connecticut n’ọnwa June afọ 2021.

N’afọ 2022, ndịisi WWE mara ọkwa na jha na-enye nnyocha ego ruru nde dọla atọ ( $3m) bụ ego a sị McMahon kwụrụ onye rụụ ụlọọrụ ahụ ọrụ ya na ya yịrị.

Nwa McMahon nwaanyị nochiri ya ma nrụọ ọrụ dịka onye ndu mana n’ọnwa Jenụị̀arị afọ 2023, McMahon laghachiri dịka onyeisi.

N’akwụkwọ Grant gbara, ọ kpọrọ nnyocha ahụ ụlọọrụ ahụ “mere mere n’ihu”, ha chọrọ isi kponye ihe mere n’ọhịa.

.Ọ sịị na ha akpọghị ya oku jụọ ya ihe ọbụla.

McMahon bụ onye kwalitere WWE ọ bụrụ ọkpọka ụlọrụ mgbasaozi nke na-agba ozi ihe ha na-eme gaa mba otu nari na iri asato nakwa asụsụ iri ato.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *