Take a fresh look at your lifestyle.

Niger, Mali na Bukina Faso apụọla na otu ‘ECOWAS’

0 231

Mba Afrịka Atọ agbaala mbụbọ puo na otu jikọtara ọdịda anyanwụ Afrịka bụ ‘Ecowas’. Mba ndị a bụ Mali, Burkina Faso na Niger.

Ha mere ka ụwa mata nke a n’ozi ha zipuru n’ihe onyonyo.

Mba ndị a kwuru na ihe mere ha jiri puo n’Ecowas bu na Ecowas dara na-enyemaka ha tụruanya n’aka ha n’ihe gbasara nchekwa obodo na ọgụ mmegide ndị oyinduegwu (terrorism).

‘’Ka afọ iri anọ na itoolu gachara, oke mba Mali,Niger na Burkina Faso ji obi mgbawa chọpụta na otu ‘Ecowas’ a hapụla ihe ndị nnanna anyị jiri hibe ya nakwa mmuo ‘Pan Africanism’’ Ọnụ na-ekwuru ndị agha mba Niger bụ Abdramane kwuru.

Cheta na otu Ecowas chupụrụ ha obere oge ka ndị agha nwerechara ọchịchị n’ike na obodo ha .

Ecowas gwara ndị agha Niger ha nwere ọchịchị nyefee na-aka mmadụ nkịtị mana ha jụrụ ajụ, ha gwara ‘Ecowas’ na ha ga-achị afọ atọ tupu ha enyeghachị mmadụ nkịtị ọchịchị, nke Ecowas jụrụ ajụ.

Na nsonso a, Burkina Faso na Rọshịa nwere mkparịtaụka n’ime onwe ha, nke gosiri na mba abụọ ahụ amalitela mekọrịta.

Ka nke a mechara, Rọshịa meghiere ụlọọru ha dị na Burkina Faso ha mechirị kemgbe ogologo oge.

Ọpụpụ mba atọ a alaala mbọ ‘Ecowas’ na agba ịjị hụ na mmadụ nkịtị weghachiri ọchịchị na mba ndị niiyi.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *