Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọakụ etiti anapụla ụfọdụ ụlọakụ ikike ịrụ ọrụ

0 439

Ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Central Bank anapụla ụfọdụ ụlọakụ dị na Naịjirịa ikike ịrụ ọrụ dịka ebe nchekwa ego ndị mmadụ.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi CBN wepụtara n’ọbaozi websaịt ha n’ụbọchị Tuzde abali iri abuo na ato nke onwa Mee, 2023 bụ onyeisi ha bụ Godwin Emefiela tinyere aka na ya.

Ndị nke a metụtara bụ ụlọakụ ‘microfinace bank’ otu narị na iri asaa na itoolu (179) na ụlọakụ mbinyeego a kpọrọ ‘mortgage bank’ anọ.

Emefiela kwuru na a na-apụrụ ndị ikike ha maka na ha hapụrụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ mere e ji nye ha ikike ma rụwazie ihe ọzọ.

O kwuru na agwa ndị a kpara megidere iwu na-achịkwa ụlọakụ na Naịjirịa a kpọrọ ‘Banks and other financial institutions Acts (BOFIA) nke 2020.

Ụfọdụ ụlọakụ ndị o metụtara gụnyere;

Atlas Microfinance Bank, Bluewhales Microfinance Bank, Everest Microfinance Bank, Igangan Microfinance Bank, Mainsail Microfinance Bank, Merit Microfinance Bank, Minna Microfinance Bank, Musharaka Microfinance Bank, Nopov Microfinance Bank, Ohon Microfinance Bank na ndị ọzọ

Leave A Reply

Your email address will not be published.