Take a fresh look at your lifestyle.

Ọgbaaghara ntulaiaka na Legọs ebughi ibu dịka o si efesa na soshal midia – Ndị uweojii

0 294

Onyeisi ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Idowu Owohunwa ekwuola na ọgbaaghara mere n’ebe dị icheiche na steeti ahụ ebughị ibu dịka o si efesa na soshal midia.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels TV n’abalị ụbọchị Satọde.

“Ana m enweta ozi si mpaghara Legọs niile. Ndị ọrụ m nọ n’ebe niile na-ewetara m ozi kwa nkeji kwa nkeji.Ya mere m ji ekwu na ọgbaaghara a, n’ezie o mere n’ụfọdụ ebe, mana o meghị ebe niile dịka akụkọ si efesa,” Owohunwa kwuru.

“Ebe ụfọdụ ọgbaaghara a chọrọ ime, ndị uweojii gbochiri ya. Ebe ndị o merela tupu ndị uweojii abịarute, anyị bịaruru n’oge ma weghachite udo ma mee ka ihe niile gawakwa n’anya ya.”

Owohunwa gokwara na o nweghị ndị uweojii ọbụla tinyere aka n’ọgbaghara dịka ndị mmadụ si ebo ha ebubo na soshal midia.

Na mpaghara Ago dị n’Okota, ebe ndị bi ebe ahụ gbochiri ndị agboro bịara ikụsa ntuliaka, onyeisi ndị uweojii bụ owohunwa kwuru na o nweghị onye nwụrụ n’ọgbaghara ahụ dịka akụkọ si efesa.

“Ndị mmadụ kụturu otu n’ime ndị agboro ahụ, mana ọ nwụghị. Ndị bịara bupu ya. Ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua n’ụlọọgwụ,” ka o kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *