Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n’otu ‘Labour Party’ bụ Peter Obi ekwpụtala mwute ya maka ndị mmadụ tụfuru ndụ ha nakwa ndị merụrụ ahụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti e mere na mpaghara naịjirịa dị icheiche n’ụbọchị Satọde,abali iri na asatonke onwa Maachị, 2003.
Obi kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute na ntuliaka, bụ ihe ekwesịghị isi oke ike, ka mmadụ ji anwụ ma na-emerụ ahụ na Naịjirịa.
“N’obi jupụtara na mwute, ana m echeta ezinụla ụmụ Naịjirịa ndị tụfuru ndụ ha nakwa ndị merụrụ ahụ n’ihi na ha sonyere na ntụliaka bụ ihe ekwesịghị isi ike,” Obi depụtara n’akara Twitter ya n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde.
“Ana m ekpesi ekpere ike ka Chineke nyere Naịjirịa aka ma zọpụta anyị n’ọnọdụ ọjọọ a.”
Leave a Reply