Otu ogige ebe a na-atụ vootu nke dị na mpghara Agungi nke dị na Lekki Legọs steeti nọzị na gbagharịa.
Nke a mere dịka ndị omekome bịara chụsa ndị pụtara ịtụ vootu na ndị ọrụ Inec nọ na mpaghara ahụ.
Ndị omekome a napụrụ ụfọdụ ndị bịara ịtụ vootu ekwentị ha.
Otu onye ntaakụkọ nọ ebe ahụ kwuru na ndị mmadụ ka nọ na-eche ka ndị ọrụ Inec laghachị azụ bido atụmvootu.
Nke a na-eso kepukepu na ndị ọrụ Inec gbara ọsọ gbaga n’ụlọ otu Eze na mpaghara ahụ. Ọ bụ nke a gbara ndị mmadụ ume mere ha ji eche ka ha pụta bido atụmvootu.
Leave a Reply