Onye Ga-abụ Onyeisiala Ariọla Ndị Naijiria Ka Ha Tụọ Vootu Ọkwa Gọvanọ N’ụzọ Udo.
Mercy Chukwudiebere dere ya na bekee
Onyeisiala a họpụtara ọhụrụ, Bola Tinubu atụnyela votu ya na ngalaba ntuliaka ya na Alausa dị n’Ikeja, Lagos Steeti, ndịda anyanwụ Naijiria.
Tinubu na nwunye ya, Oluremi sonyeere oge ntụnye vootu ahu.
Onyeisiala a họpụtara toro usoro ntuli aka ahụ ma gbaa ndị bi ebe ahụ ume ka ha nọrọ n’udo n’oge mmemme ahụ.
Ọ sịrị; “Ka m sonyeere ndị Naijiria ndị ọzọ n’ịrụ ọrụ obodo m na ntuliaka Gọvanọ na ndị Omebeiwu na-aga n’ihu.
“A na m agba unu ume ka unu pụta ma tụọ vootu n’udo.”
Ndị ọrụ na ngalaba nchekwa steeti wụchiri ogige ntuliaka nke Tinubu iji weta nchekwa dịka akụkụ ọrụ ha n’ebe onye isi ala họpụtara.
Leave a Reply