Take a fresh look at your lifestyle.

Aka akparala ndị POS anọ na-ana oke ọnụ iji nye ndị mmadụ ego ọhụrụ

0 313

Otu nke Ụlọakụ Etiti hibere maka ime ka ego naịra ọhụrụ gbasaa nke ọma na Naịjirịa anwụchiela mmadụ anọ na-eji igwe POS enye ndị mmadụ ego, maka ịna ndị mmadụ oke ọnụ tupu e nye ha ego ọhụrụ.

Onyeisi otu a bụ Harry Agbo, onye jikwa ọkwa Deputy Director n’ụlọakụ etiti’, na ụfọdụ ndị uweojii, ndị EFCC na ndị ICPC gara na mpaghara dị icheiche na Benue Steeti iji mata etu ya bụ atụmatụ si aga.

Ụlọntaakụkọ ‘Daily Trust’ kwuru na ha nwụchiri mmadụ anọ na-eme POS bụ ndị na-ana ndị mmadụ puku naịra abụọ maọbụ puku naịra atọ iji nye ha puku naịra iri n’ego ọhụrụ.

Ha chọpụtakwara na ọtụtụ ndị POS enweghị ego ọhụrụ ha ga-enye ndị mmadụ, ụfọdụ n’ime ha ka na-akwụ ego ochie, ma na-ana narị naịra abụọ iji kwụọ ndị mmadụ ego ochie.

Nke a na-abịa dịka Ụlọakụ Etiti kwuru na ha ga-etinye ntaramahụhụ siri ike maka ndị nkịtị na-eji igwe POS enye ndị mmadụ ego ma na-ana nnukwu ego iji nye ha naịra ọhụrụ.

Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde n’ọgbakọ ya na ndị na-anọchite anya mba ofesi dị icheiche na Naịjirịa (diplomatic corps) n’ụbọchị Tuzde.

O kwuru na ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-enwe nhịahụ dị icheiche n’ihi mgbanwe naịra, mana uru ga-esi na ya pụta karịrị akarị.

Ọ rịọkwara ndị nnọchite anya mba ofesi ndị a ka ha nabata atụmatụ mgbanwe naịra a maka na ọ bụ ka o wee dị mma.

Lee akara ekwentị ị ga-eji kpesa maka ndị POS na-ana oke ọnụ maka ego ọhụrụ

Otu n’ime ndị isi CBN aha ya bụ Joseph Omayuku kwuru ka ndị mmadụ weta mkpesa maka onye POS ọbụla na-ana karịa ego ole o kwesịrị iji nye ndị mmadụ ego ọhụrụ.

Omayuku kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde na Bayelsa dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu; ma nyekwa akara ekwentị ndị mmadụ ga-akpọ iji mee mkpesa a.

Akara ekwentị ahụ bụ 07002255226; maọbụ onye ahụ eziga ozi n’akara email bụ: contactcbn@cbn.gov.ng maọbụ site n’akara soshal midia nke CBN.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *