Take a fresh look at your lifestyle.

Mgbakọ ndị isi US-Africa: Prezidenti Buhari laghachiri Abuja

0 636

Onyeisiala Naijiria bu,Muhammadu Buhari laghachiri n’Abuja ka ọ gachara nzukọ ndị isi mba Amerịka na mba Afrịka.                                                        Onye isi ala Buhari, bụ onye metụrụ aka na nku onye isi ala nke ọdụ ụgbọ elu Nnamdi Azikiwe International Airport nke dina Abuja natara onye minista na-ahụ maka isi obodo Ramatu Tijjani, onye Inspector General of Police, Usman Alkali na ndị isi nke ụlọ ọrụ nchekwa ndị ọzọ.                     Onye ndu Naijiria apụọla na Washington DC ka ọ gaa nzụkọ a, nke gọọmentị US haziri maka ndị isi Africa.                                                                             Na nzụkọ ahụ, onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kelere onyeisiala Buhari maka ime ka ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa na Africa pụta. Ọ gwakwara mba Afrịka ka ha na-eme ntuliaka n’afọ na-abịa, ka ha hụ na ha mere ntuliaka n’udo na nke doro anya.                                                           Onyeisiala Buhari jiri ohere ahụ dọta ndị ọchụnta ego mba Amerịka na Naịjirịa, na-emesi ha obi ike na ikuku dị ha mma maka ịzụ ahịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *