Ụgbọelu mba Tanzania bu ndị njem adaala n’ike danye na mmiri Lake Victoria, dị n’obodo Bukoba, gbuo opekata mpe mmadụ iri na itolu n’ụbọchịụka.
N’ime mmadụ iri anọ na atọ nọ n’ụgbọelu ahụ, mmadụ iri abuo na anọ ka azọpụtara na ndụ, dịka ụlọọrụ nwe uụgbọelu ahụ bụ Precision Air si kwuo.
Ọkwọụgbọelu ugboelu ahụ abụọ dị ndụ mana Praim minista mba ahụ kwuru na o nwere ike ha anwụọlarị.
Ụgbọelu ahụ dara na nso ikperemmiri dị nso n’ebe nkwụsị ọdọụgbọelu dị n’obodo Bukoba.
Ndị gbatagbata banyere n’ime mmiri were gụpụta ndị tọọrọ n’ime ụgbọmmiri ahụ danyere na mmiri.
Otu onye aha ya bụ Abdul Nuri nọ n’ọdọụgbọelu ahụ na-eche ịlaghachi n’obodo Dar es Salaam,hụrụ ụgbọelu ahụ ka na-etinye isi na mmiri ezu ahụ kachasị n’Afrịka.
“Ọ tụrụ anyị n’anya. Egwu jidere ndị mmadụ, ụfọdụ na-ebe akwa, ụfọdụ na-eti mkpu.”
“Na mpaghara ebe e si abata abata, ndị mmadụ nwekwara obi mmapụ – ọtụtụ n’ime ha bịara ịnabata ndị nke ha na-alọta.”
Nuri na ndị ọkụazụ bụ ụzọ rute ebe ọdachi ahụ mere kpakwara.
Ha gwara ya na ha gbalịị banye n’ime ụgbelu ahụ oge otu n’ime ndị ọrụ ụgbọelu ahụ gbapere ụzọ azụ. ka ụgbọelu ahụ dachara.
Ọdachi ahụ nke mere ebe elekere 8:50 bụ ajọ ọnọdụ ihu igwe ka a sị butere ya.
Ndị ọrụ gbatgbata ji eriri kpụrụ ụgbọelu ahụ kpụta ya na nso ikpere mmiri.
Leave a Reply