Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ntuliaka ịhọpụta onye ga-efe ọkọlọtọ APC n’ọkwa Onyeisiala si aga

0 695

Taa ka a ga-ama dike ga-efe ọkọlọtọ pati All Progressive Congress (APC) iji zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023

Nke a na-abịa dịka ndị pati a gbakọtarala n’Eagle Square dị n’Abuja ime ntuliaka ime ụlọ a ga-eji họpụta onye ahụ.

Dịka o siri dị, ọ bụ mmadụ iri abụọ na atọ ga-aba n’ọgbọ ịmata onye ga-enwete ọkolọtọ ahụ.

Amalitela imere ndị delegates accreditation maka ntuliaka ịhọpụta onye ga-efe ọkọlọtọ ha n’ọkwa Onyeisiala si aga

N’ụbọchị ole na ole ka ọtụtụ ndị Gọvanọ APC si mpaghara Ugwu nwere nkwekọrịta ka a họpụta onye si mpaghara Ndịda.

Ebe kepukepu ọzọ kwuru na onyeisioche APC bụ Abdullahi Adamu họpụtara Ahmed Lawan bụ onyeisi ndịomeiwu dịka onye a kpọrọ ‘consensus candidate’

Lai Muhammed, mgbe ọ gara hụ ka e si ahazị Eagles Square n’abali isii nke ọnwa Juun, ebe a ga-eme ya bụ ntuliaka ime ụlọ ndị APC, a kpọrọ APC Presidential Primaries n’abali asaa nke ọnwa Juun, 2022

Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari na nzukọ ya na ndị Gọvanọ nwere sị na O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n’isi.

Ọ sị ka e nye onye ọbụla na-azọ ọkwa ohere ka ndị pati ha nwee ike họpụta onye ha chọrọ.

Dịka ọ dị ugbua mmadụ iri abụọ na atọ ndị na-azọ ọkwa a ga-aba n’ihu ọrụ maka ntuliaka a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *