Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria ga ezute mba Sudan n’asompi iko mba Afrika taa

0 519

Asọmpi a ga-adị n’ọgbọegwuregwu Roumdé Adjia, Garoua, nke mba Kameruun ma ọ kụọ elekere ise nke ehihie Satọde.

Ọ bụrụ a Super Eagles merie nke a pụtara na ha etozuola oke ịbanye n’agba ọzọ nke asọmpi a.

Sudan chọrọ mmeri iji nwee olileanya ịbanye n’agba nke ọzọ.

Cheta na Naịjirịa ji ọtụ ọkpụ goolu merie Ijipt n’asọmpi mbụ ebe Sudan na Guinea-Bissau gbara nghatanha.

Ndị a na-atụ anya ga-akpa ike

Kelechi Iheanacho bụ nwafọ Naịjirịa nyere goolu Naịjirịa ji merie ndi mba  Ijipt ma nwete ihe nrite dịka onye kacha agba n’asọmpi ahụ.

Onye ọzọ kpakwara ike ndị mmadụ kpụụ n’ọnụ bụ Moses Simon n’ihi etu o si nye ndị Ijipt nsogbu n’asọmpi ahụ.

Ndị mmadụ sị na o chetere ha ihe mere n’etiti Moses nke Izrelụ na Pharoah nke Ijipt dịka e dere n’akwụkwọ nsọ.

Anya ga na-elekwa ndị ọzọ na-agbara Super Eagles bọọlụ mgbe egwu ga-ebiri ọkụ.

Oche goolu ha bụ Ali Aboeshren chere penariti ma bụrụ onye kachasị agba n’asọmpi ha na ndị Guinea-Bissa.

Yasin Hamed nke na-agba bọọlụ n’ofesi bụ onye ọzọ kpụ ọkụ n’ọnụ na mba Sudan dịka ọ ga-edu ha aga agha ahụ.

Ihe ndị nchịkọta na-ekwu

Onye nchịkọta otu Super Eagles bụ Augustine Eguavoen sị na o cheghi n’asọmpi ahụ ga-abụ ofe nkupu nye ha.

Anyị maara ihe ọrụ nyere, anyị ga-anwa ike anyị ịhụ na anyị gafere dịka mba Kameruun“.

Burhan Tia bụ onye nchịkọta Sudan sị “Anyị ma ike ndị Naịjirịa mana ọ gaghị ekpochi anyị igosi ha ka anyị si kwadoo na nke ikpeazụ a”.

“Anyị ma na Naịjirịa na-akpa ajọ ike, ha ga-achọ imeri mana otu ọbụla nwere ihe ha pụrụ ime”.

Etu Naịjirịa na Sudan si kwụrụ n’asọmpi AFCON

Naịjirịa na Sudan ezutela onwe ha n’asọmpi Iko Mba Afrịka naanị ugboro abụọ kamgbe 1957 ọ maitere.

Nke mbụ ha zutere n’afọ 1963, Sudan ji ọkpụ goolu anọ a na-asataghị otu merie Naịjirịa (SUDAN 4 – 0 NIGERIA, 1963).

Nke abụọ ha zutere n’afọ 1976, Naịjirịa ji otu ọkpụ goolu merie ha (NIGERIA 1- 0 SUDAN, 1976).

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *