Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

Lee obodo e ji naanị naịra iri abụọ na ise alụ nwaanyị n’ịgbankwụ

0 82

Ịlụ nwaanyị n’ala Igbo so n’emume kachasị oke mkpa.

Ụfọdụ na-ahụta ya ka ihe dị omimi ma dịkwa oke ọnụ.

Mana o were anya na ihe kachasị eri ego n’alụm nwaanyị n’ala Igbo bụ nri na mmanya a na-enye ndị ọgọ.

Nke ahụ abụghị iwu, mana e kwesiri inye ndị bịara gị mmeme ihe oriri na ihe ọṅụṅụ dịka aka ha onye na-eme ihe.

Ụgwọ isi nwaanyị bụ ihe kachasị mkpa n’emume alụm nwaanyị nke Bekee kpọrọ ‘pride price’.

Ihe a na-akwụ n’isi nwaanyị dị iche iche dịka omenala ndị sị dị.

N’Arochukwu ugwu isi nwaanyị bụ ọkwa isii, nke pụtara naịra iri abụọ na ise (N25.00).

Mana ọ bụghị ya bụ naanị egọ a na-emefu n’ịlụ nwaanyị ebe ahụ.

Ihe ndị ọzọ na-erikwa ego bụ ihe a na-enye ụmụnna na ndị ikwu na ibe.

Ihe ndị a dịkwa iche iche dịka omenala ndị si dị.

Mana ugbua, ndị ụfọdụ na-etinye ihe na-adibughị n’akwụkwọ omenala ndị obodo ha, ọkachasị ma ha hụ na onye chọrọ ịlụ nwa ha nwaanyị nwere ego.

Kirie ka ndị Arochukwu si eme nke ka.

Leave A Reply

Your email address will not be published.