Take a fresh look at your lifestyle.

Ụkọchukwu Alia Emeriela Na Ntụliaka Mmegharị

Aloysius Umalo dere ya na Bekee

0 426

Kọmitii na-ahụ maka ntuliaka mmegharị maka ọkwa gọvanọ nke All Progressives Congress (APC), na steeti Benue, ekwupụtala Ụkọchukwu Hyacinth Alia dịka onye meriri na mmegharị ahụ e mere na mpaghara ọchịchị ime obodo iri na otu nke steeti ahụ.

Onye isi oche nke kọmitii ntuliaka ahụ, Sịnetọ Basheer Lado, onye kwuputara mpụtara ntuliaka ime ụlọ ahụ, kwuru na Ụkọchukwu Alia nwetara ngụkọta vootu 219,002 iji merie mmadụ iri na otu ndị ọzọ na ntuliaka ahụ.

Dịka onye isi oche Kọmitii ahụ si kwuo, onye bụbu Attorney General of Federation na Minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi, Maazị Micheal Aondoakaa nwetara vootu 606 ebe onye bụbu onye isi oche nke National Democratic Party, NDP, Sịnetọ Barnabas Gemade nwetara ngụkọta vootu 450.

Sinetọ Lado kwuputakwara na onye bụbu Mịnịsta steeti Niger Delta, Dọkịnta Sam Ode nwetara vootu 255 ebe onye otu ụlọ omebe iwu bụ Hon. Herman Hembe nwere ngụkọta vootu 688.

Na mpụtara ndị ọzọ, onye bụbu osote aka na-achị Benue steeti, Ochagu Steven Lawani nwetara vootu 120, Dọkịnta Matthias Ibuan nwetara vootu 4,797, Ọkammụta Terhemba Shija nwetara vootu 219, Arc. Benard Yisa nwetara vootu 136 ebe Maazị . Ayom Mlanga nwetara vootu 766 ma Maazị Terwase Orbunde nwetara vootu abụọ

Sinetọ Basheer Lado kọwara na Ụkọchukwu Alia nwetara votu kachasị elu ka a chịkọtara mpụtara sitere kansụl iri na otu na mmegharị ahụ were tinyere ya mpụtara kansul iri na abụọ ndị ọzọ otu paati ahụ mere na mbụ were rute na nchịkọta ọnụ ọgụgụ ahụ.

Ọ jara ndị nnọchi anya ndị sonyere na ntuliaka ime ụlọ ahụ maka ezi akparamagwa ha n’oge mmemme ahụ ma gbaa ha ume ka ha jisie ike na paati ahụ ruo mgbe e nwetara mmeri na ntuliaka izugbe.

Na nzaghachi mpụtara si n’emume ahụ n’ọgbakọ pụrụ iche, Onye isi oche APC na Steeti Benue, Maazị Austin Agada kwughachiri mkpebi siri ike nke otu paati ahụ iji weghachi steeti Benue na ụzọ mmepe site na mkpọmkpọ ebe ọchịchị PDP debere ya.

Agada kwuru na ya ahụla akara mmeri a na-ahụ anya dị n’akụkụ APC na Benue steeti ebe Ụkọchukwu Alia nwetara mmeri ọzọ na mmegharị ntuliaka ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, kọmitii mkpegharị ikpe nke ndị isi ọchịchị etiti nke APC hibere ga-amalite nzukọ otu ụbọchị na Fraịde iji nụrụ mkpesa gbadoro ụkwụ na mmegharị ntuliaka ahụ site n’aka ndị so zọọ ọchịchị.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *