Take a fresh look at your lifestyle.

Ụkọ Akwụkwọ Ego: Onyeisiala Buhari Ga-Ekpebi Ihe Ọzọ

Timothy Choji dere ya na Bekee

0 350

Onyeisiala Muhammadu Buhari n’ụbọchị Fraịde gwara ụmụ amaala Naijiria ka ha nye ya ụbọchị asaa iji dozie nsogbu ụkọ akwụkwọ ego nke ghọrọ ihe iche aka mgba n’ime mba ahụ site n’atụmatụ nke ụlọ akụ etiti ịgbanwe akwụkwọ ego mba ahụ.

Mgbe ọ na-agwa ọgbakọ ndị gọvanọ okwu bụ ndị bịara n’ụlọ ebe obibi Onyeisiala ka ha chọọ ọgwụgwọ maka ụkọ akwụkwọ ego nke ha kwuru na ọ na-etetọ mbọ nke gọọmenti nọ ugbu a n’igbanwe akụ na ụba mba ahụ.

Onyeisiala Buhari kwuru na nhazigharị akwụkwọ ego ga-eme ka akụ na ụba dịkwuo mma ma na-enye uru dị ogologo oge ma na-egosipụta obi abụọ banyere ntinye aka nke ụlọ akụ karịsịa maka ọganihu nke amụma ahụ. “Ụfọdụ ụlọ akụ adịghị arụ ọrụ ma na-eche naanị banyere onwe ha”, Onyeisiala ahụ kwuru, “ọbụlagodi na agbakwunyere otu afọ, nsogbu ndị metụtara ịchọ ọdịmma onwe onye na anyaukwu agaghị apụ.”

O kwuru na ya ahụla akụkọ telivishọn gbasara ụkọ akwụkwọ ego na ihe isi ike nye ndị azụmaahịa obodo na ndị nkịtị ma kwe nkwa iji abalị asaa n’ime abali iri a ma mebie ihe ọ bụla na-egbochi mmejuputa mgbanwe akwukwo ego ahụ.

“M ga-alaghachi na ụlọ akụ etiti na ụlọ ọrụ mbipụta akwụkwọ ego. A ga-enwe mkpebi n’otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ n’ime ụbọchị asaa fọdụrụnụ n’ime ndọtị ụbọchị iri ahụ,” Onyeisiala kwere nkwa a.

Mkpesa

Ndị Gọvanọ ahụ gwara Onyeisiala na, ebe ha kwekọrịtara na mkpebi ya maka imeghari akwụkwọ ego dị mma ma na-akwado ya nke ọma, mana mmejupụta ya bụzi ihe na-ebute nsogbu nye ndị mmadụ.

Ha gwara Onyeisiala na dịka ndị isi ọchịchị na paati na steeti ha dị iche iche, ha na-enwe nchegbu maka ndakpọ akụ na ụba na usoro ntuliaka na-abịa.
.
Ha rịọrọ Onyeisiala ka o jiri ike ya kwado njekorita akwụkwọ ego ọhụrụ na nke ochie n’otu oge ruo na ngwụcha afọ.

Onyeisiala ahụ kwuru na mgbe ọ tụlere inye nkwado na amụma ahụ, ọ rịọrọ ka ụlọ akụ etiti kwenye na ọ nweghị akwụkwọ ego a ga-ebipụta na mba ofesi ma nyekwa ya obi ike na e nwere ikike na akụrụngwa zuru ezu iji bipụta ego n’ime mba ahụ.

O kwuru na ọ dị ya mkpa ịlaghachi azụ iji chọpụta ihe na-eme n’ezie.

Onyeisiala Buhari gwara ndị gọvanọ na ka ọ na-adị ndị mmadụ nso, na ya anụla akwa ha na ya ga-eme ihe ga-eme ka ọ dị mma.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *