Take a fresh look at your lifestyle.

Sedentary Lifestyle: Etu ịnọdụ ala ogologo oge nwereike isi gbuo gị

0 394

Ụwa anyị bi n’ime ya ugbua adịghị etu ọ dịbụ na mgbe gboo. N’oge gara aga, ndị mmadụ na-eji ụkwụ agagharị, na-aga ahịa, ọrụ ugbo, achụ nta, nakwa na-eme njem.

Ụwa ọgbara ọhụrụ a bụ nke na-akwado oke ịnọdụ ala, ma mmadụ a chọrọ ya ma ọ chọghị ya.

Ọtụtụ mmadụ na-anọ ala ogologo awa n’ime ụgbọala, n’ụlọakwụkwọ, n’ụlọọrụ, n’ụlọ ọkachasị oge anyị na-elele ihe onyonyo TV.

Ndị sanyesị nakwa ndị ọrụ ahụike enyopụtala na oke ịnọdụ ala nwereike ibutere mmadụ ọtụtụ ọnọdụ ahụike ọjọọ nke nwereike idula mmadụ mmụọ.

Ụfọdụ ọrịa nakwa ọnọdụ ahụike oke ịnọdụ ala nwereike ịbutere mmadụ gụnyere: Ọrịa shuga, ọrịa obi, ụfọdụ ọrịa kansa, oke ibu (nke na-akpata ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ) nakwa ọnwụ.

Dọkịnta Emma Wilmot gbara ama nke a dịka ọ kọwara na nnyocha ha gosiri na ndị na-anọ ala ogologo oge na-ebutekarị ọrịa ndị a.

Nke bụ eziokwu bụ na e nyochapụtara na ịnọdụ ala ogologo oge na-emetụta mmepụta ihe na-enye ike n’ime ahụ mmadụ nke Bekee na-akpọ ‘Glucose’, nakwa akụrụngwa nke a na-akpọ ‘insulin’, bụ ihe na-enye aka ka Glucose na-adị n’ọbara mmadụ etu o kwesịrị.

 

Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ n’ime ụgbọala ka ndị mmadụ na-anọ ogologo awa n’ime ya.

Onye ọkachamara ọzọ, bụ Dọkịnta Udodi Okoli, kwukwara na “ịnọdụ ala ogologo awa nwere ike ịkpata nsogbu n’ọkpụkpụ azụ mmadụ, ọkachasị ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị anọdụ ala n’ụzọ kwesịrị ekwesị, maọbụ na ọ naghị eji oche ahaziri maka ịnọdụ ala n’ụzọ dị mma”

Ọ kọwara na ọ bụrụ na mmadụ na anọ ala ogologo awa n’ihu kọmpụta ya ma odobeghi isi ya maọbụ olu ya n’ụzọ ziri ezi, olu nwereike imalite igbu ya mgbu.

Okoli kwuru na ịgba mbọ kwụrụ ọtọ ma gagharịa nwereike inye aka belata ọnọdụ ndị a.

O kwukwara na mmadụ anaghị emegharị ahụ nwereike ime mmụọ ya daa mba maọbụ o nwereike ịmetụta ahụike echiche ya n’ụzọ ọjọọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *