Take a fresh look at your lifestyle.

Netanyahu etuola ebum n’obi Donaldi Trump banyere Gaza

0 137

Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu etuola ebum n’obi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump banyere ọnọdụ Gaza.

Netanyahu kwuru nke a n’oge ọ nabatara odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio n’Izrel.

Netanyahu kwuru na mba Izrel na mba Amerịka na-arụkọ ma dị njikere iweputa “usoro a ga-eji hazie Gaza”.

Ka Netanyahu na Marco na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ha kwupụtara nkwekọrịta ha nwere maka ikpochapụ ikike ọbụla ndị otu Hamas nwere ịguzobe gọọmeti mọabụ ịbụ ndị ọchịchị na Gaza.

Ihe ọzọ ha nwere nkwekọrịta na ya bụ ịkwụsị mba Iran ịweta ngwaagha ‘nuclear’ nakwa ịtinye anya n’ihe na-eme na mba Syria kemgbe a kwaturu ọchịchị Assad.

Marco Rubio gara Izrel ka nnukwu ogbunigwe mba Amerịka bunyere ha rutere mba ahụ ma kwuo na “ndị Hamas agaghị adị ka ndịgha gọọmenti maọbụ ndịagha nkịtị”.

Izrel na Amerika katọkwara otu “International Criminal Court” ma sị na ha ji ụlọikpe ahụ ebuso mba Izrel agha nke ha kpọrọ “Lawfare” nakwa ịmetọ aha mba Izrel.

A na-atụanya na Marco ga-ezute ndị ọchịchị mba Rọshịa na Saudi Aribia maka iwe nkata banyere iwete udo na Yukren.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *