Otu onyeisi na gọọmentị mba Yukren ekwuola na mba ahụ agaghị eso eme mkparịtaụka udo ahụ nke mba Amerịka na Rọshịa chọrọ ka e mee na mba Saudi Arabia.
Onye ahụ gwara ndi ntaakuko na mba Yukren enwetebeghị akwụkwọ ozi sị ha bịa n’ọgbakọ ahụ ma kwuo na ọ bụ ya mere na ha aghaghị ezịga onye ọbụla.
Mmadụ abụọ bụ ndị na-arụrụ Onyeisiala mba Amerịka ọrụ na ngaraba mmekọ mba ahụ na mba ụwa bụ Mike Waltz na Steve Witkoff ga-eje mba Saudi Arabia bụ ebe e kwesiri ịnọ mee ọgbakọ ahụ.
Na mbụ, Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky adọọla aka na ntị sị na mba ha agaghị ekwete n’ihe ọbụla e mere n’azụ ha.
N’aka nke ọzọ ndị ọchịchị na Yurope ga-enwe ọgbakọ gbatagbata maka nchekwa dịka ha na-atụ anya na mba Amerịka na Rọshịa ka enwe nkwekọrịta banyere agha dị na Yukren.
Leave a Reply