Take a fresh look at your lifestyle.

Ejide nwoke gburu ma bekasịa ozu ọnyị ya nwaanyị na Steeti Kwara

0 158

Ndị uweojii na Kwara steeti ekwuola etu ha si nwuchie nwoke gburu ma bekasịa ozu ọnyị ya nwaanyị dị afọ iri abụọ n’atọ na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Adetoun Edjire-Adeyemi sị na aha nwaanyị ahụ e gburu bụ Yetunde Lawal.

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ mgbe ha wetere ozi na Yetunde na-efu efu ka ha bidoro ime nyocha n’ekwentị Yetunde nke mere ha ji nwuchie nwoke ahụ ha na-enyoenyo dị afọ 29.

Akụkọ na-ekwu na nwoke ahụ na Yetunde na-akpa n’ekwentị tupuu ọ sị Yetunde bịa n’ụlọ ya ebe ọ nọ gbuo ya ma bekasịa ozu ya.

Ndị uweojii sị na ezinaụlọ Yetunde bidoro na-achọ ya achọ n’abalị iri nke ọnwa Febuwarị afọ 2025, mana ha jiri naanị abalị anọ chọta ebe ozu ya dị ma hụ etu e si bekasịa ya.

Yetunde bụbu nwataakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ “College of Education” dị n’Ilorin na Kwara steeti tupuu e gbuo ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *