Ndị ndụ mba Yurope ga-enwe ọgbakọ pụrụiche banyere agha na-eme na mba Yukren n’izuụka na-abịa abịa, maka na mba Amerịka na Rọshịa chọrọ inwe mkparịtaụka udo nke nwereike igbochi ndị Yorupe esola.
Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer kwuru na ọgbakọ a bụ nke na-abịa naanị otu mgbe dị oke mkpa maka nchekwa mpaghara ụwa ahụ, ma kwuo na Yurope kwesịrị iwere ọnọdụ n’otu Nato.
Nke a na-abịa dịka ndị nnọchiteanya mba Amerịka na Yukren kwuru na a ga-eme ka ndị Yurope maara maka mkparịtaụka Amerịka na Rọshịa mana ha agaghị eso na ya.
Ndị ndu n amba Amerịka gụnyere odeakwụkwọ mba ha bụ Marco Rubio na ndị nnọchịteanya mba Rọshịa ga-enwe mkparịtaụka na mba Saụdi Arebịa. Ndị ọrụ Amerịka kwuru na a kpọkwara mba Yukren oku isonye n’ọgbakọ ahụ mana Onyeisiala ha bụ Volodymyr Zelensky kwuru na mba ha anataghị ozi dị etu ahụ.
Praịm minister Starmer hụtara ọrụ ya dịka ịgba mbọ hụụ na Amerịka na Yurope nwere nkwekọrịta banyere udo n amba Yukren.
Ọ ga-eme ka mba Amerịka mata ebumnobi ndị Yurope mgbe ọ ga-eme njem izute Onyeisiala Donald Trump na ngwụcha ọnwa a.
N’otu aka ahụ ndị ndu Yurope na Zelensky ga-enwe ọgbakọ maọbụrụ na Praịm minister Starmer si mba Amerịka lọta.
Leave a Reply