Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuliaka AU: Onyeisiala Tinubu Ekeleela Ambassador Adeoye

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 355

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kelere onye nnochite anya Bankole Adeoye maka nhọpụta ya ọzọ dịka Kọmishọna African Union (AU) na-ahụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị, Udo, na nchekwa. Ma kọwakwaa mmeri ahuya dị ka nke kwesịrị ekwesị.

Onyeisiala Tinubu kwuru na verified X handle ya, @officialABAT, na Wenezde na ezi ọchịchị, nraranye maka ndozi esemokwu nakwa nkwụsi ike mpaghara nke sitere n’aka Maazị Adeoye enyerela aka n’ịkwalite ụkpụrụ nchekwa n’ime Afrika.

Onyeisiala kwuru na nke a bụ mmeri nye Naijiria na kọntinent Afrika ka Naịjirịa na-aga n’ihu na-eso mba ndị ọzọ n’ime kọntinent ahụ na-arụkọ ọrụ iji nweta Afrika dị nchebe ma dịkwa n’otu.

“Mmeri nke a bụ mmeri nye Naijiria nakwa kọntinent niile ka anyị na-arụ ọrụ iji mee ka Afrịka dị nchebe na nke dị n’otu,”

Onye isi ala Tinubu kwusiri ike na Naijiria na-agbasi mbọ ike n’ịkwalite udo na nkwụsi ike n’ofe mpaghara ahụ.

Onye isi ala kwusiri ike na Naijiria na mba Africa ibe ya na AU na-aga n’ihu, na-ekwusi ike na mba ahụ na-etinye aka n’ịkwado usoro nchekwa nke kọntinent ahụ.

Onyeisiala Tinubu gosipụtara obi ike na ọchịchị Maazị Bankole ga-aga n’ihu iweta ezi ụsa nye nsogbu nchekwa ma kwalite ọchịchị onye kwuo uche ya.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *