Take a fresh look at your lifestyle.

Ahọpụtara Adeoye Onye Naijiria Dị Ka Kọmishọna AU

Margaret Ebeshi dere ya na bekee

0 338

Onye nnọchianya mba Naijiria bụ Ambassador Bankole Adeoye ka ahọpụtalarịị maka oge nke abụọ dị ka Kọmishọna African Union (AU) na-ahụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị, Udo na nchekwa nke bụ PAPS n’aha mkpirisi.

Adeoye nwetara vootu iri atọ na asaa were merie onye nnochite anya Jean-Jacques Demafouth si Central Africa Republic bụ onye nwetakwara vootu iri na otu na ntuli aka e mere na nnọkọ 46th Ordinary Session of the Executive Council n’Addis Ababa nke Ethiopia.

Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Naịjirịa bụ Yusuf Tuggar na nkwupụta nke onye enyemaka pụrụiche na mgbasa ozi na nkwukọrịta ozi, Alkasim Abdulkadir, kelere Adeoye.

Tuggar kwuru na nhọpụta nke Adeoye bụ ihe na-egosi na ọ bụ onye ndu ya pụtara ìhè, ọkachamara n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, na ntinye aka na-adịghị agwụ agwụ n’ịkwalite udo, nchekwa, na nkwụsi ike n’ofe mpaghara Afrịka.

Tuggar kwuputara na “ahụmahụ na onye ndu Adeoye ga-enyere aka n’ịkwalite atụmatụ nchekwa udo, usoro mgbochi esemokwu, na mbọ ijikọ mpaghara n’ime usoro AU.

Ntuliaka nke ndị kọmishọna agaferela ma chere ntuliaka nke onye isi oche nke AU. Nke a ga-eme n’abalị iri ise nakwa iri isii ọnwa Febrụwarị n’Addis Ababa nke Ethiopia.

Ndị ga-esonye na ntuliaka ọkwa kachasị elu a gụnyere
onye bụbu Praịm Minista mba Chad, Moussa Faki Mahamat,
onye bụbu Praim Mịnịsta mba Kenya, Raila Odinga,
onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ego n’mba Madagascar, Richard Randriamandrato,
nakwa onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi na Djibouti bụ Mahmoud Ali Youssouf.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *