Pastọ Chris Oyakhilome onye yi uwe e ji mara ya, lere anya n’igwe fọtọ wee kwupụta na “e nweghị ihe akaebe na ọgwụ mgbochi na-arụ ọrụ”.
N’okwuchukwu ya ọ gbasara na YouTube n’onwa February, Oyakhilome kwuru na “a ghaalare onye ọbụla ụgha gbasara ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa.”
A maara ya dị ka “Pastor Chris”. Ọ gbara afọ iri isii ma bụrụ otu n’ime ndị nkwusa ozi ọma a kacha mara n’mba Afrịka.
Nyocha ọtụtụ okwuchukwu ya BBC mere site na n’afọ 2023 na 2024, chọpụtara na ọ na-agbasa ozi mgbochi nye ndị na-eso ụzọ ya nke gbadoro ụkwụ n’ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ọhụrụ a na-ekesa na mba Afrịka.
Ọrịa ịba bụ nnukwu nsogbu n’Afrịka. Ihe ruru pasent 95% nke ọnwụ metụtara ọrịa ịba mere na kọntinent Afrịka n’afọ 2022. Otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ WHO, kwuru na ụmụaka na-erubeghị afọ ise pasent 80% anwụọla site n’ọrịa ịba.
N’ime ọnwa isii gara aga, ụlọ ọrụ Pastọ Oyakhilome ewepụtala opekatampe akwụkwọ akụkọ ise gbasara ịbu agha megide ọgwụ mgbochi ọrịa nke ọ kesara n’ụlọ ụka, gbalarị iwu ụlọọrụ na-ebu agha megide agha ogwu mgbochi.