Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọọrụ Elon Musk etinyela igwe ịntanetị ‘wireless chip’ n’ụbụrụ mmadụ

0 283

Elon Musk ekwupụtala na ụlọọrụ ya bụ Neuralink entinyela igwe ịntanetị a kpọrọ ‘wireless brian chip’ n’ụbụrụ mmadụ.

Ọ sịrị na ọ bụ onye nke mbụ a na-etinye igwe a rụpụtara n’ụbụrụ ya.

Elon Musk kwuru na ha chọpụtara onye ahụ nwere obere nsọgbụ, orịa mkpalị akwara ma na ugbua ọ na-agbake nke ọma.

Ebumnuche ụlọọrụ ahụ bụ ijikọ ụbụrụ mmadụ na igwe kọmpụta ma kwuo na ọ chọrọ inye aka n’ịgbaso ọnọdụ akwara dị mgbagwoju anya.

Ọtụtụ ụlọọrụ na-ama aka etinye ngwaọrụ ndị yiri ihe Elon Musk ha mere.

Ndị ntaakuko gakwuuru ma Neuralink na onye na-ahụ maka ahụike na mba Amerịka, ndị nchịkwa nri na ọgwụ (FDA) ka ha tinye ọnụ n’okwu a.

Ndị FDA nyere ụlọọrụ Elon Musk ikike ka ha nwalee atụmatụ itinye igwe intanetị chip a n’ụbụrụ mmadụ n’onwa Mee, mgbe ha nwechara ihe ndọghachị azụ n’oge mbụ ha chọbụrụ inwete ikike.

Musk n’ozi o wepụtara n’akara X ya, kwuru na Telepathy bụ aha a ga- akpọ ngwaahịa mbụ a Neuralink mepụtara.

O kwuru na Telepathy ga-eme ka mmadu nwee ike “jikwaa ekwentị ma ọ bụ kọmpụta nakwa ihe ndị ọzọ ọ na-eme site n’iche echiche.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *