Take a fresh look at your lifestyle.

IPAC na-arụọ INEC ka eme ezi ntuli aga emeghari n’Enugwu

0 282

Ndị otu Inter Party Advisory Council (IPAC) dị n’Enugwu steeti, enyela ụlọ ọrụ Independent Electoral Commission (INEC) ọrụ ka ha hụ na ntuliaka e mere n’ụbọchị Satọdee n’Enugwu bụ nke kwesịrị ntụkwasị obi.

 

IPAC kwuru nke a n’akwụkwọ ozi onye isi oche ya bụ Maazị Godwin Alor binyere aka na ya ka e nwechara nzukọ pụrụiche ha nwere n’Enugwu ụbọchị Tuzde.

 

Alor gwara INEC ka ha nye ndị nleba anya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha leba anya na ntuliaka ahụ.

Ọ nyekwara ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha na-enye nchekwa zuru oke tupu ntuli aka, n’oge na mgbe emechara.

 

Nzukọ ahụ ji obi ụtọ gosi na nchekwa dị mma na steeti ahụ, site n’aka Gọvanọ Peter Mbah.

 

“O jara gọvanọ mma na nke a ma gbaa ya ume ka ọ gaa n’ihu n’otu ụzọ ahụ,” ka o kwuru.

O kwuru na nzụkọ a gara n’ihu hiwe otu kọmitii ndị okenye nwere mmadụ atọ ga-emekọrịta ihe dị iche iche dị na ngalaba IPAC steeti tupu ntuli aka ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *