Take a fresh look at your lifestyle.

Mba Amerịka ewepụtala aha ndịagha ha e gburu na mba Jordan

0 292

Mba Amerịka ewepụtala aha mmadụ atọ bụ ndịagha ha ogbunigwe ‘drone’ gbagburu mgbe a wakporo ọdọ ndịagha ha na mba Jordan.

Ndị a gụnyere Sgt William Jerome Rivers dị afọ iri anon a isii, Kennedy Ladon Sanders dị afọ iri abuo na ano na Breonna Alexsondria Moffett dị afọ iri abuo na ato bụ ndị e gburu n’ebe obibi ha.

Amerịka na-ebe ebubo na ọ bụ ndịagha nnupuisi mba Iran na-akwado mere mwakpo ahụ, obi ochịchị Pentagon kwuru na ndị a ji “nzọm ụkwụ” otu Kataib Hezbollah.

Pentagon kwuru na mba Amerịka achọghị ibuso Iran agha.

“Anyị achọghị ịlụ agha, mana anyị ga-eme ihe ma zaghachị oku na mwakpo a wakporo ndịagha anyị,” ka ọnụ na-ekwuru Pentagon bụ Sabrina Singh kwuru.

Ụlọ ntaakụkọ CBS tụpere azụ na onye ọrụ mba Amerịka kwuru na ụgbọelu ‘drone’ e ji tụọ ogbunigwe ahụ dịka nke mba Iran mepụtara.

O kwuru na ọ bụ ụdịrị “drone a na-akpọ Shahed,” bụ ụdịrị nke mba Iran na-ebugara mba Russia.

Iran agọọla n’ebubo mba Amerịka na Briten boro ha na ha kwadoro otu agha nnupuisi mere mwakpo ahụ.

Isiụlọọrụ mba Amerịka bụ Pentagon kwuru na ndịagha atọ ahụ e gburu n’ụtụtụ Sọnde so n’otu ndịagha ha nke Fort Moore dị na Steeti Georgia.

Ọchịagha Jody Daniels, onyeisi ndịagha nchereoge nke mba Amerịka kwanyere ndịagha e gburu ugwu nke ikpeazụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *