Take a fresh look at your lifestyle.

Iran agọọla na aka ha adịghị n’ogbunigwe gburu ndịagha Amerịka n’okeala Jordan

0

Mba Iran ekwuola na aka ha adịghị n’ogbunigwe ahụ gbara n’ogige ndịagha Amerịka dị n’okeala Syria na Jordan nke gburu ndịagha mmadụ atọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

Nke a na-abịa dịka mba Amerịka na-ebo ndịagha nnupuisi nke Iran na-akwado na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe ahụ.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden aṅụọla iyi na mba Amerịka ga-azaghachị mwakpo ahụ n’oge na-adịghị anya.

Iran kwuru na ebubo ahụ enweghi ebe mgbakwasị ụkwụ ma sị na o soghi na-eme mkpebi ndị otu agha nnupuisi a mere.

Ndị ọrụ mba Amerịka kwuru na mmadụ iri atọ na anọ merụrụ ahụ, ha kwuru na e bupụla mmadụ asatọ ka ha nata ọgwụgwọ ebe ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ ọjọọ.

Mba Jordan akatọọla mwakpo ahụ ma sị na ya na mba Amerịka na-arụkọ ọrụ iji hụ na e chekwara okeala ahụ.

N’otu aka mba Briten na Iraq akatọọkwala mwakpo ahụ ebe Iraq kwere nkwa inyeaka n’ịkwụsị ihe ọbụla ga-ebute ọgbaghara na mpaghara ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *