Take a fresh look at your lifestyle.

Otu onye anwụọla ebe ndị ọzọ na-efu efu n’ọdọ ngwupụta mmanụ agbidi na Delta Steeti

0 307

Otu onye anwụọla ebe a na-achọ mmadụ atọ achọ mgbe ọdọ ebe a na-egwupụta mmanụ nke ụlọọrụ Seplat dara na Delta Steeti.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi ụlọọrụ mmanụ agbidi a wepụtara nke kwuru na ọdachi a mere n’ụbọchị Tuzde abali iri na ise nke onwa Ọgọọst, 2023.

Ihe onyonyo gosiri mgbe ọdọ ngwupụta mmanụ ahụ na-emikpu n’osimmiri malitere ifesa na soshal midia.

Ụlọọrụ a kwuru na ọ bụ naanị otu onye nwụrụ n’ime mmadụ karịrị iri itoolu nọ n’ọdọ ngwupụta mmanụ ahụ.

“Ụlọọrụ Seplat Energy agbarụọla ihu maka ọdachi mere n’ọdọ ebe a na-egwupụta mmanụ nke Depthwise swamp rig Majestic’ n’ụtụtụ a” dịka Roger Brown bụ onyeisi ọrụ ha kwuru.

O kwuru na nke a mere n’akụkụ obodo Ovhor nke Delta Steeti.

Ụlọọrụ a kwuru na ahụla mmadụ iri itoolu na abụọ n’ime mmadụ iri itoolu na isii nọ n’ọdọ ahụ dịka otu onye nwụrụ, mmadụ atọ na-efu efu.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.