Take a fresh look at your lifestyle.

Abụbọ ọrụ NLC, ngagharịiwe na ihe ndị ọzọ nwereike ịdapụta n’izuụka

0 345

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na gọọmentị etiti ekwuola na a ga-ewepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala na Naịjirịa. Nke a bụrụla okwu akpụ n’ọnụ n’akụkụ dị iche iche ọkachasị dịka okwu mwepụ ego a mere ka ọnụego mmanụ ụgbọala ria oke elu ugbua.

Okwu a emeela otu jịkọrọ ndị ọrụ oyibo Naịjirịa bụ NLC n’ịchafụ jiri maa ọkwa ma gwa ọha ka ha kee nkwụcha maka abụbọọrụ nakwa ngagharịiwe ha sị ga-amalite n’ụbọchị Wenezde, abalị asaa nke ọnwa Juun, 2023.

Nke a bụ etu ha siri saa atụmatụ gọọmentị nakwa ọkwa ibuli ego iri mmanụ ụgbọala ụlọọrụ ‘Nigerian National Petroleum Corporation’ (NNPC) wepụtara n’ụbọchị Tọọzde.

Gịnị bụ iwe NLC?

Otu jịkọrọ ndị ọrụ oyibo Naịjirịa bụ NLC n’ịchafụ kwuru n’izu gara aga na ha ga-agba abụbọ ọrụ nke enweghi onye ma oge nkwụsị ya n’izu a n’ihi iri elu n’ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa ugbua. Ndị otu a jụrụ mgbanwe ego a na-ere mmanụ ụgbọala nke gọọmentị wepụtara dịka ha kpọrọ ya ‘ihe mkpasu iwe’ na ‘ihe dịka mbakwudo n’ike’. Ọgbakọ gọọmentị etiti na n’ime abalị Wenezde ebighi na nkwekọrịta ọbụla.

NLC nyere gọọmentị ruo abalị Tuzdee ka ọ gbanwee mbuli ego a maọbụ ha amalite ngagharịiwe nakwa abụbọ ọrụ:

Onyeisi otu a bụ Joe Ajaero gwara ndi ntaakuko:

“Gọọmentị ahọpụtaghị ndị ọrụ ọbụla nwereọkwa ga-agwa anyị okwu, ndị anyị na ha na-akpakọrịta enweghị ọkwa oche ọbụla zuruoke”

Otu ahụ na-ekwu na ọ bụ naanị NNPC na-ebubata ngwaahịa mmanụ ala ugbua ma na-ekwu na ọ bụghị ihe dịịrị ha ihibe ọnụego mmanụ ụgbọala na-ada ugbua dịka ha abụghị ụlọọrụ gọọmentị kpọm kwem.

Cheta na ụlọọrụ NNPC n’ụbọchị Wenezde, buliri ọnụego mmanụ ụgbọala site na N184 gaa ihe nọ n’agbata 488 – 557 naịra kwa lita.

Naijiria bụ mba nke abụọ na-emepụta mmanụ n’Afrịka na-ada n’azụ Angola mana na-ebubata ihe karịrị pasentị iri itolu nke mmanụ mmanụ ya n’ihi enweghị ike nụchaa mmanụ n’ime mpaghara anọ n’ime ụlọ nrụpụta steeti nwere arụrụ arụ.

Ọtụtụ na-atụkwa egwu na otu ndị ọzọ nwereike isonye na ngagharịiwe nakwa abụbọ ọrụ a na-abịa dịka ihe dị etu meburu n’afọ 2012 mgbe aka chiburu Naijirịa bụ Goodluck Jonathan nwara wepụ ego mbelata a. Ya bụ ngagharịiwe ‘Occupy Nigeria’ kpọturu karịa otu izu n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *