Ọchịchịrị nwereike ịgba na Naịjirịa dịka ndị ọrụ ọkụ latrik na-akwado ịgba abụbụọrụ n’ụbọchị Wenezde abali asaa nke onwa Mee, 2023.
Otu a kpọrọ ‘National Union of Electricity Employees (NUEE)’ enyela ndị otu ha iwu ka ha kwụsị inye ọkụ maka mwepu ego enyemaka ibelata ọnụego mmanụ ụgbọala nke gọọmentị wepuru.
Nke a na-abịa site na ndụmọdụ otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ ‘Nigeria Labour Congress (NLC)’ nyere sị ka ndị otu ha niile malite abụbụọrụ n’ime izuụka.
Otu NUEE site n;akwụkwọ ozi ha wepụtara gwara ndị otu ha kwụsị ọrụ n’isiụtụtụ ụbọchị Wenezde.
NUEECopyright: NUEE
Otu NLC nyere gọọmentị malite ugbua ruo ụbọchị Tuuzde iweghachị ọnụego mmanụ ụgbọala n’ebe ọ dịbu na mbụ ma ọ bụghị ya na ha ga-amalite abụbụọrụ na ngagharịiwe.
Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu n’abali iri abuo na itolu nke onwa Mee, 2023 e duru ya n’iyi ọrụ kwuru na ‘subsidy’ alaala kpam kpam.
N’ihi nke a ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ ‘Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL)’ jiri ihe karịrị pasentị narị abụọ bulie ọnụego mmanụ ụgbọala.
Leave a Reply