Take a fresh look at your lifestyle.

Etu e si edu Alex Otti n’iyi ọrụ dịka Gọvanọ Abia Steeti

0 316

Ndị Abia steeti achọghị ịma maka mmiri ọ na-ezo dịka ha pụtara n’igwe ịbịa duo Alex Otti n’iyi ọrụ dịka Gọvanọ ha.

Otti onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa ga-abụ gọvanọ nke ugboro nke Abia Steeti.

Ndị nchekwamjukwara ebe niile nakwa ndị ọnụ na-eru n’okwu.

Tupu a malite emume idu n’iyi ọrụ a, onye nnochiteanya Alex Otti bụ Caleb Ajagba gara n’obi ọchịchị gọọmentị Abia ga nata akwụkwọ ọchịchị site n’aka gọọmentị na-apụ apụ.

Ọ bụ odeakwụkwọ gọọmentị bụ Chris Ezem nyefere akwụkwọ ọchịchị ahụ n’aka gọvanọ ọhụrụ.

Ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma maka Otti

  • Alex Otti bụ onye ọrụ ụlọakụ banyere na ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ọ rituru n’ọkwa onyeisi ụlọakụ ‘Diamond Bank'( buzi Access Bank ugbua).
  • Onye Isiala ngwa, Otti gara akwụkwọ Primari na Sekọdịrị n’Abia tupu ọ gaa mahadum ‘University of Port Harcourt’ bụ ebe ọ gụrụ “Economics’ ma jiri nzere ọkaibe ‘First Class” were pụta n’afọ 1988.
  • O nwere nzere MBA ” na mahadum ‘University of Lagos’ bụ nke o nwetara n’afọ 1994.
  • Ọ gaala ọzụzụ ndị ọzọ dị iche iche na Naijiria nakwa mba ofesi ma bụrụkwa onye eji ọrụ inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.