Take a fresh look at your lifestyle.

E mere ngagharịiwe n’Ebonyi dịka ndị omekome wakporo ogige atụmvootu

0 285

E mere ngaghariiwe na Omege ward nke dị n’okpuruọchịchị Ezza Nọt nke Ebonyi steeti maka etu ndị omekome siri wakpoo ogige a na-atụ vootu ma gbaa akụrụngwa ndị Inec ji arụ ọrụ ọkụ.

Otu onye akaebe kwuru na ndị omekome a bịara, gbalie egbe elu ma merụọ mmadụ atọ ahụ n’ebe ahụ.

Onye a kwuru na ndị a gbara akụrụngwa Inec nke gụnyere igwe BVAS ọkụ.

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ na-ewute ya ma sị, ” Anyị nọ ebe a kamgbe ụtụtụ maka ịtụ vootu anyị,ụmụnwaanyị niile nọ ebe a bịara ịtụ vootu ha, anyị chọrọ itụ vootu dịka ọ bụ ikike ruru anyị”.

N’aka nke ọzo ka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii stetti ahụ bụ Onome Onopvewakpoyeya kwuru na ya bụ ihe mere ma sị, “Eee anyị nụrụ na ndị omekome bịara wakpoo ebe ahụ ma were Bvas na ihe ndị ọzọ gbaa ọsọ, kama ugbua anyị na-eme ngagharị na mpaghara obodo, anyị na-agba mbọ maka ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *