Take a fresh look at your lifestyle.

2023: Amụma enweghị ego na-ewusi usoro ntuli aka ike – Ndi Bauchi

0 426

Ndị na-eme ntuli aka na steeti Bauchi, North East Nigeria, ekwuola na amụma enweghị ego nke Central Bank of Nigeria nyere aka mee ka usoro ntuli aka siri ike na mba ahụ dum.                                                                                                                                                                                                                       Mgbe ha na-agwa Voice of Nigeria okwu ka ha tụnyechara vootu ha n’ụfọdụ ngalaba ntuliaka ahọpụtara ndị a na-eleba anya n’ime ọchịchị ime obodo Bauchi, ụfọdụ ndị ntuli aka kwuru na usoro a dị n’udo n’ihi na ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị anaghị enweta ego ha na-enweta ndị omekome iji dọpụ uche na usoro ahụ.                                                                                                                                                                                                                                        Voice of Nigeria hụkwara na ọnọdụ udo nwere n’oge ntuli aka ahụ gbasakwara na mpaghara ọchịchị ime obodo iri abụọ na steeti ahụ. Ha tokwara na iji Bimodal Voters Accreditation System, BVAS, dị n’ime iwu ntuliaka 2022 bụ nke ha kwuru na-eme ka usoro a dị mfe na ngwa ngwa. Ka ọ dị ugbu a, ntuliaka onyeisiala na ụlọ ọgbakọ omebe iwu akwụsịla, a na-agụkwa votu n’ụlọ ọrụ nchịkọta dị iche iche n’ogbe ọchịchị ime obodo iri abụọ na steeti bauchi.                                                                                                                                                                                                                                                                  Ebe a ga-ekwupụta rịzọlt nke ndị meriri n’ụlọomeiwu mba ahụ n’ogo steeti dị iche iche, a ga-ebuga rịzọlt onyeisiala na National Collation Center dị n’Abuja, Naijiria ka onyeisi oche INEC megharịa ya.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.