Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe Ukwu Akwụsịtụla Oge Mmechi Akwụkwọ Ego Ochie

Salihu Ali dere ya na Bekee

0 409

Ụlọikpe ukwu nke Nigeria egbochiela Gọọmenti etiti iga n’ihu imejuputa atụmatụ nke demonetization.

Steeti atọ dị na mgbago ugwu mba ahụ ndị gụnyere Kaduna, Kogi na Zamfara steeti, nọọrọ n’abalị atọ nke ọnwa Febrụwarị tinye akwụkwọ mkpesa n’ụlọikpe kasị elu iji kwụsịtụ ụlọ akụ etiti ịga n’ihu n’atụmatụ Naira Redesign Policy.

Ndị ọkaikpe mmadụ asaa nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Ọkaikpe John Okoro nọ n’isi ya, nọọrọ na mkpebi ha
n’otu, nye ikike nwa oge ma machibido gọọmentị Naijiria, ụlọ akụ etiti na ụlọ akụ azụmahịa imejuputa abalị iri ọnwa Febrụwarị dị ka oge njedebe maka akwụkwọ ego ochie ịdị ire.

Ụlọikpe ahụ gara n’ihu kwuo na gọọmentị etiti, ụlọ akụ etiti na ụlọ akụ azụmahịa wdg agaghị aga n’ihu na njedebe nke oge akwụkwọ ego Naira ochie rue mgbe a ga-ekpebi okwu n’abalị iri na ise ọnwa Febrụwarị.

Site na mkpebi a, akwụkwọ ego Naira ochie ga-aga n’ihu ịdị ire n’Naijiria.

Ndị na-agba akwụkwọ tinyekwara akwụkwọ mkpesa maka mbelata oge ruo ụbọchị ise site na ụbọchị e tinyere mkpesa ahụ nke Attorney General of Federation (AGF) nwere ike itinye nzaghachi n’ikpe ahụ.

Steeti ndị ahụ gbakwụnyere n’akwụkwọ nkwado, “gọọmenti etiti bagidere atụmatụ mgbanwe akwụkwọ ego Naira n’oge adabaghị adaba yana oge ekwesịghị ekwesị, ya mere nke a ebutego ọnọdụ ọjọọ nye ụmụafọ Naijiria nọ na steeti Kaduna, Kogi na Zamfara nakwa gọọmentị ha, ọkachasị n’ihi na akwụkwọ ego naira e megharịrị ọhụrụ a dị nnukwu ụkọ.

Ụlọ ikpe ukwu nke Naijiria mechaara kachie okwu a n’abalị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị maka mkpebi ikpe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *